Psalms 76

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.

Ike mmeri nke Chineke

1A maara Chineke nʼobodo Juda;
aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.
2Ụlọ ikwu ya dị na Salem,
ebe obibi ya dị na Zayọn
3Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,
na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela

4Ị jupụtara nʼìhè,
ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.
5A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,
ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha;
o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a
pụrụ iweli aka ya abụọ elu.
6Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,
ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu. a

7Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?
8I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị.
Ụwa tụkwara egwu, dere duu,
9mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe,
ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela
10Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,
ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.

11Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha;
ka ndị ala niile bụ agbataobi unu
wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.
12Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala;
ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.
Copyright information for IboBIU